Deuteronomy 9

Ọ bụghị nʼihi ezi omume Izrel

1Nụrụ, Izrel! Taa ka ị na-aga ịgafe osimiri Jọdan ịbanye ka inweta ala mba ndị dị ukwuu na ndị dị ike karịa gị, inweta obodo ndị dị ukwuu nke nwere mgbidi ha dị elu ruo nʼeluigwe. 2Ndị bi nʼime ha bụ ndị Anak, ndị gbara dimkpa, too ogologo nke ukwuu. Ị maara banyere ha. Ị nụkwaala ka e kwuru sị, “Onye pụrụ iguzo onwe ya nʼihu ụmụ Anak?” 3Ma mata taa na Onyenwe anyị Chineke gị bụ onye na-aga nʼihu gị dịka ọkụ na-erepịa erepịa. Ọ ga-ala ha nʼiyi. Ọ bụkwa ya ga-eme ka unu lụgbuo ha, chụpụ ha, bibiekwa ha ngwangwa dịka Onyenwe anyị kwere gị na nkwa.

4Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị sitere nʼihu gị chụpụ ha, asịla onwe gị, “Onyenwe anyị akpọbatala m nʼebe a, ka m nweta ala a nʼihi ezi omume m.” Mba, ọ bụ naanị nʼihi ajọ omume nke mba ndị a bi nʼala ahụ ka Onyenwe anyị ji esite nʼihu gị chụpụ ha. 5Ọ bụghị nʼihi ezi omume gị, maọbụ izi ezi nke obi gị ka ị ga-eji nweta ala ahụ, kama ọ bụ nʼihi ajọ omume nke mba ndị a bi nʼime ya ka Onyenwe anyị Chineke gị ga-eji achụpụ ha site nʼihu gị. Ọ na-emekwa ya nʼihi imezu nkwa ahụ o kwere nna nna gị ha bụ Ebraham, Aịzik, na Jekọb. 6Ya mere, ghọta ya nke ọma na Onyenwe anyị Chineke gị anaghị enye gị ezi ala a ka inweta ya nʼihi ezi omume gị, nʼihi na unu bụ ndị isiike.

Nwa ehi ọlaedo

7Chetakwa nke a ma echefukwala otu i si kpasuo Onyenwe anyị Chineke gị iwe, mgbe mgbe, nʼime ọzara. Site nʼụbọchị ị hapụrụ Ijipt tutu ruo taa, ka ị na-enupu isi nʼebe Onyenwe anyị nọ. 8Unu kpasuru Onyenwe anyị iwe nʼugwu Horeb, ya mere o jiri were iwe laa unu nʼiyi. 9Mgbe m rigooro nʼelu ugwu ahụ ịnata mbadamba nkume ndị ahụ bụ mbadamba nkume ọgbụgba ndụ dị nʼetiti Onyenwe anyị na unu, anọrọ m nʼelu ugwu ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, ọ dịghị nri m riri, ọ dịghịkwa mmiri m ṅụrụ. 10Onyenwe anyị nyere m mbadamba nkume abụọ ndị ahụ, nke eji mkpịsịaka Chineke dee. Edekwasịrị nʼelu ha iwu niile nke Onyenwe anyị gwara unu nʼugwu ahụ site nʼetiti ọkụ, nʼụbọchị mkpọkọta ahụ.

11Mgbe iri abalị anọ gwụrụ Onyenwe anyị nyere m mbadamba nkume abụọ ndị ahụ, bụ mbadamba nkume ọgbụgba ndụ. 12Mgbe ahụ ka Onyenwe anyị gwara m sị m, “Rịdata ọsịịsọ, nʼihi na ndị gị, ndị i si nʼIjipt dupụta, emerụọla onwe ha, ha emeela ngwangwa iwezuga onwe ha site nʼiwu m nyere ha. Ha emeerela onwe ha nwa ehi a kpụrụ akpụ, ka ọ bụrụ chi ha.”

13 Onyenwe anyị gwara m sị, “Ahụla m na ndị a bụ ndị isiike nʼezie. 14Hapụ m, ka m kpochapụ ma hichapụkwa aha ha site nʼokpuru eluigwe. Aga m emekwa gị ka ị ghọọ mba dị ike karịa, dịkwa ọtụtụ nʼọnụọgụgụ karịa ha.”

15Ya mere, atụgharịrị m malite isi nʼugwu ahụ na-enwu ọkụ rịdata, ejikwa m mbadamba nkume abụọ nke ọgbụgba ndụ ahụ nʼaka m. 16Mgbe m lepụrụ anya, ahụrụ m na unu emeela mmehie megide Onyenwe anyị Chineke unu. Unu akpụọlara onwe unu arụsị nʼụdị nwa ehi. Unu esitela nʼịgbaso iwu Onyenwe anyị wezuga onwe unu ọsịịsọ. 17Mgbe ahụ, ewere m mbadamba nkume abụọ ahụ, tụpụ ha site nʼaka m abụọ, kụrie ha nʼihu unu.

18Mgbe ahụ, adara m nʼala ọzọ nʼihu Onyenwe anyị. Iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, erighị m nri maọbụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ ọbụla, nʼihi mmehie niile unu mere. Unu mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị si otu a kpasuo ya iwe nke ukwuu. 19Atụrụ m egwu iwe na ọnụma nke Onyenwe anyị, nʼihi na iwe ya dị ukwuu megide unu ruo na ikpochapụ unu. Ma nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gere ntị nʼarịrịọ m. 20Nʼoge ahụ, Erọn nʼonwe ya, nọrọ nʼoke nsogbu, nʼihi na Onyenwe anyị were iwe megide ya, chọọ ibibi ya, ma arịọrọ m Onyenwe anyị arịrịọ nʼihi ya. 21Mgbe ahụ, eweere m ngwa ọrụ mmehie unu, ya bụ nwa ehi ahụ unu kpụrụ, kpọọ ya ọkụ, tipịa ya, gwerie ya nke ọma dịka ntụ, wụnye ntụ ya nʼime mmiri nke si nʼugwu na-asọpụta.

22Ọzọkwa, unu kpasuru Onyenwe anyị iwe na Tabera, na Masa, ọ bụladị na Kibrọt Hataava.

23Mgbe Onyenwe anyị si na Kadesh Banea zipụ unu ọ sị unu, “Gaanụ nweta ala ahụ m nyere unu.” Ma unu nupuru isi nʼiwu Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu. Unu ekwenyeghị maọbụ rubere ya isi. 24Site nʼụbọchị m maara ndị unu bụ, ọ dịbeghị mgbe unu na-enupughị isi nʼebe Onyenwe anyị nọ.

25Ọ bụ ya mere m jiri daa nʼala nʼihu Onyenwe anyị iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, nʼihi na Onyenwe anyị kwuru na ọ ga-ala unu nʼiyi. 26Ekpere m ekpere nʼoge ahụ nye Onyenwe anyị sị ya, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị biko, alala ndị gị nʼiyi, nʼihi na ha bụ ihe nketa gị, bụrụkwa ndị i ji ike aka gị na ebube gị gbapụta site nʼIjipt. 27Elekwasịla nnupu isi ha na isiike ha anya, kama, cheta nkwa gị, nke i kwere ndị ohu gị, Ebraham, Aịzik, na Jekọb. Biko, agụnyela ndụ ọjọọ ha, na mmehie ha megide ha. 28Ma ọ bụghị otu a, ndị obodo ahụ nke i si na ya kpọpụta anyị ga-asị, ‘Ọ bụ nʼihi na Onyenwe anyị apụghị inye ha ala o kwere ha na nkwa ka o ji laa ha nʼiyi. Nʼihi na ọ kpọrọ ha asị, ka o ji kpọbata ha nʼime ọzara mee ka ha nwụọ nʼebe ahụ.’ 29Ma ha bụ ndị gị, ha bụkwa ihe nketa gị. Ha bụ ndị i sitere nʼike gị dị egwu na ike nke aka gị kpọpụta site nʼIjipt.”

Copyright information for IboBIU